Psalms 44

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil nke ụmụ Kora.

Ekpere maka mgbapụta

1O Chineke, anyị anụla;
nna anyị ha agwakwala anyị
ihe ndị i mere nʼoge ha,
nʼoge gara aga.
2I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ,
ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi.
I gwepịara ndị ahụ
ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa.
3Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a,
ha emerighị site nʼike nke aka ha;
ọ bụ aka nri gị, aka gị,
na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.

4Ị bụ eze m na Chineke m,
onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.
5Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị,
ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị.
6Atụkwasịghị m obi m nʼụta m,
mma agha m anaghị enye m mmeri;
7ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ,
ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị.
8Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile,
anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela

9Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala;
ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ.
10I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga,
i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị.
11Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ,
ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile.
12I rere ndị gị ọnụ ala,
ihe i retara ha abaghị uru nye gị.

13I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị,
anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu.
14I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile,
ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị.
15Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu,
ihere m na-ekpuchikwa m ihu,
16mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị,
nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ.

17Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị,
ma anyị echefubeghị gị.
Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị.
18Obi anyị ahapụbeghị gị!
Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị.
19Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị,
jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị.

20Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị,
maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị,
21ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya,
ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi?
22Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile.
A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.

23O, Onyenwe m teta! Gịnị mere i ji arahụ ụra?
Kpọtee onwe gị! Ajụkwala anyị ruo mgbe ebighị ebi.
24Gịnị mere i ji ezopụ ihu gị,
ma chefuo mmegbu na ịta ahụhụ anyị?

25E tidala anyị nʼala, nʼuzuzu,
ahụ anyị rapara nʼaja
26Bilie ma nyere anyị aka;
gbapụta anyị maka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ.
Copyright information for IboBIU